Jeremiah 18

NʼỤlọ ọkpụ ite

1Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya. 2“Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.” 3Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe. 4Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.

5Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, 6Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel. 7Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla, 8ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube. 9Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya, 10ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya.

11“Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’ 12Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ”

13Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị,

“Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile,
onye nụrụla ihe dị otu a?
Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke
emeela ihe jọgburu onwe ya.
14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa
kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn?
O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi,
nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
15Ma ndị m echezọọla m.
Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi,
bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile.
Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie.
Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ,
nke a na-ewuzighị ewuzi.
16Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu.
Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi.
Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha,
nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.
17Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha
dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ.
Aga m agbakụta ha azụ.
Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.”
18Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha,
Maọbụ, gwajuo ya okwu afọ
gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”

19Gee m ntị, Onyenwe anyị.
Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m.
20O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma?
Ma lee na ha egwuolara m olulu.
Chetakwa na m guzooro nʼihu gị
ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha.
Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.
21Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ.
Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha.
Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di.
Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha,
ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.
22Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa,
mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede.
Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m,
ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ.
23Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị,
maara nzube ọjọọ ha niile igbu m.
Agbagharala ha ajọ omume ha;
maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị.
Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị;
mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.
Copyright information for IboBIU